#IgboFACTCHECK: Mmiri e nwetara site n'ịbanye unere na-achaghị acha na mmiri, ọ na-agwọ ọrịa ọlsa?
Otu onye na X, @Nig_Farmer, dere na ịṅụ mmiri e nwetara ka a banyere ...
Otu onye na X, @Nig_Farmer, dere na ịṅụ mmiri e nwetara ka a banyere unere na-achaghị acha ruo ihe ruru ụbọchị atọ na-agwọ ọrịa ọnyá afọ (ọlsa).
Mkpebi: NDUHIE
Ọnyá ...afọ, ma ọ bụ ọlsa, bụ ọnyá na-egbu mgbu n'ime eriri afọ. Ihe na-akpata ya bụ njé bacteria Helicobacter pylori (H-pylori). Ihe ọzọ na-akpata ya bụ iji ọgwụ non-steroidal anti-inflammatory drugs (NSAIDs) eme ihe ruo ogologo oge.
Na Naijiria, agbụrụ dị iche iche na otu mmekọrịta ọha na eze na akụ na ụba na-eri unere na-achaghi nke ọma. Enwere ike ịmegharị ya ngwa ngwa ka ọ ghọrọ ngwaahịa ndị ọzọ bara uru dị ka "Boli" (unere a ṅara n'ọkụ) nke a ga-eri na ntụ ọka ma ọ bụ stew, ntụ ọka unere (maka amala), ibe osisi unere, dgz
Akwụkwọ akụkọ Nigerian Journal of Pharmaceutical and Applied Science Research 2021, kọwara na azụ́ unere nwere ọkwa dị elu nke mineral, mmiri, na phytochemicals dị iche iche, nke nwere ike ibụrụ ihe mere o jiri nwee ihe mgbochi ọnya afọ ndị ọ gosipụtara, nke mere na enwere ike iji ya jikwaa ọgwụgwọ ọnyá afọ.
Mana ọ gbakwụnyere na ọ dị mkpa ka a mukwuo ka azụ unere si arụ ọrụ iji kewapụ ma mara ogige ndị na-ahụ maka ọrụ mgbochi ọnya afọ ma chọpụta usoro e kwesịrị iji ya mee ihe.
Dị ka akwụkwọ akụkọ Journal of Science and Research 2020 si kwuo, a chọpụtara na nnyocha e ji oké mee, na nkwadebe dị iche iche nke azụ́ unere kpọrọ nkụ bụ ihe mgbochi nye ọnya afọ nke ọgwụ aspirin na-akpata, ma dị irè di ka prophylactic ya na ọgwụgwọ ọnya afọ nke aspirin butere.
Nnyocha ndị ọzọ nke National Library of Medicine, akwụkwọ ebipụtara na India na 2014, British Pharmacological Society Journal, na Journal of Ethnopharmacology 1999 mere na oké na-egosi na a chọpụtara na unere na-achaghị acha bụ ihe na-egbochi ọnyá afọ aspirin na-akpata na oke, ma e nweghị ihe kwadoro na ọ na-egbochi ya na mmadụ.
Agbanyeghị, Dr Adenike Enikuomehin, onye ndụmọdụ endocrinologist na Mahadum Medical Sciences Teaching Hospital (UNIMEDTH), Akure, dị na steeti Ondo, kwuru na ịmara ihe kpatara ọnya afọ na-enye aka ịmata ụzọ a ga-esi gwọọ ya.
Ọ gbakwụnyere na ọ dị mkpa nyocha iji chọpụta ma azụ unere na-achaghị acha o na-arụ ọrụ n'ezie n'ịgwọ ndị ọrịa ọnya, n'ihi na ndị mmadụ na-anabata ihe ngwọta ọ bụla nke yiri ihe omimi na-achọpụtaghị ma ọ dị irè.
N'otu aka ahụ, onye na-ahụ maka ọrịa gastroenterologist na UNIMEDTH, Akure, Dr Kenechukwu Okonkwo, kwuru na nkwupụta a abụghị eziokwu, na-agbakwụnye na nkwupụta a abụghị nke sayensị kwadoro.
"Ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ọnyá afọ, ha kwesịrị ịga ụlọ ọgwụ ma hụ dọkịta ga-enyocha ma nye ọgwụ ndị dị mkpa," ka o kwuru.
END CREDITS
Onye Odee: Funmilola Afolabi
Onye Ntụgharị: Jahnedu Ibekwelu
Onye na-akọ akụkọ: Ijeoma Opara
Mụtakwuo: https://factcheckhub.com/does-water-obtained-from-soaking-unripe-plantain-cure-ulcer/[+] Show More